Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị.
Arịrịọ maka ime ebere
1Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị;ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.2Ezonarịla m ihu gịnʼụbọchị nsogbu m.Gee ntị nʼekpere m,zakwaa m ngwangwa.3Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ;ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.4Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa;ana m echefu iri nri m.5Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ,enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.6Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara,a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.7Ana m amụ anya abalị niile;adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.8Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị;ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.9Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m,anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m10nʼihi oke iwe gị,i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.11Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada.Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.12Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi;aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.13Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ,nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola;oge ahụ a kara aka eruola.14Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị;mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.15Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị,ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn,ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.17Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa;ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.18Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu,ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:19“Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya,o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,20ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọna ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”21Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn;a ga-eto ya na Jerusalem,22mgbe mba niile na alaeze niile,ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.23O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m;o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.24Nʼihi ya, ekwuru m sị,“Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ;ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.25Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa,eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.26Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide;ha ga-erichasị dịka akwa ochie.Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya,ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.27Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe,ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.28Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide;ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”