Abụ Ọma101ibo_bib

Abụ Ọma Devid.

Nkwa eze

1Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi;o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.2Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla,olee mgbe ị ga-abịakwute m?Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụlajegharịa nʼime ụlọ m.3Agaghị m edo ihe jọgburu onwe yanʼihu m.Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị.Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.4Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso.Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.
5Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo,onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ;agaghị m anabataonye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.
6Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya,ka mụ na ha biri;onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụlaga-ejere m ozi.
7Onye ọbụla na-aghọ aghụghọagaghị ebi nʼụlọ m;onye ọbụla na-ekwu okwu ụghaagaghị eguzokwa nʼihu m.
8Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duubụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a;Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihesite nʼobodo Onyenwe anyị.