1Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu?Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda?2Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ,nʼagbata ụzọ niile.3Nʼọnụ ụzọ nke obodo niilena nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,4ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị;ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.5Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke;unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.6Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu;Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,7Ọnụ m na-ekwu eziokwunʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị.8Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma.Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.9Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya;nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.10Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọchahọrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.”11Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa.Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.12“Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta.Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.13Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.Akpọrọ m nganga na mpako,omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.14Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m;enwekwara m ọmụma ihe na ike.15Site na m ka ndị eze ji achị,ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.16Site na m ka ndị eze ji achịbụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.17Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya.Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.18Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ,na ikpe ziri ezi na ezi omume.19Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha,ọ karịkwara ọlaedo.20Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume,nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi.21Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba.Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.22“Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya,tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ.23Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị;adịkwa m adị tupu e kee ụwa.24Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri,tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa,25tupu e kee ugwu ukwuna ugwu nta.26E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwana osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.27Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya,mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;28mgbe o hiwere mbara eluigwe,mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,29mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị,ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya,mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.30Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka.Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ;ana m egwuri egwu nʼihu ya.31Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ,ụwa niile na ụmụ mmadụ!32“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị;nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.33Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe,agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.34Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m,onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile,onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;35nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ;ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.36Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ;ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”