1Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m,gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a.2Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche,ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.3Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.4Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluiludịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.5Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.6Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.7Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.8Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,9ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.10Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.11Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụmgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.12Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!“Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!13Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi mmaọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.14Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibinʼihu ọha mmadụ niile.”15Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.16Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?17Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.18Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.19Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,ka ara dị ya nʼobi zuore gị,ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.20Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?21Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya,ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.22Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi;mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya.23Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị;ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.