Ilu4ibo_bib

Amamihe Kachasị ihe niile

1Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,lezienụ anya ka unu nwee nghọta.2Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu;ya mere, unu ahapụkwala iwu m.3Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m,mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,4ọ ziri m ihe, sịkwa m,“Ka obi gị jidesie okwu m niile ike,debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.5Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.6Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.7Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.8Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu.Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.9Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mmanyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”
10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị;ị ga-enwekwa ndụ ogologo.11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe,duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị,ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha,nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.14Emela dịka ndị na-emebi iwu.Esokwala ụzọ ha.15Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha;chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,16nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ.Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.17Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu,na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.
18Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ,nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.19Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị,ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
20Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu.Gee ntị nke ọma.21Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile;ka ha bamiekwa nʼime obi gị,22nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha,bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.23Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.24Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.25Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu;atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.26Leruo ije ụkwụ gị anya,doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.27Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe;si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.