Ilu29ibo_bib

1Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ,nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
2Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ,ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
3Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa,ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
4Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu,ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
5Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mmabụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
6Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama.Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.
7Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye,ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.
8Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile,ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.
9Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe,onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
10Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị,ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya,ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
12Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha,ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
13Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a:ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
14Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe,a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
15Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa,ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
16Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị,ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.
17Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ.Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
18Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro,ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
19Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị,nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
20Olileanya dịrị onye nzuzukarịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.
21Ị malite na mbụ na-emezi onye na-ejere gị ozi,ọ ga-emesịa chọọ ka i meere ya dịka nwa gị.
22Onye na-ewe iwe na-akpali ọgụ,onye na-ewe iwe ọkụ na-eme ọtụtụ mmehie.
23Nganga mmadụ na-eme ka ọ daa,ma mmadụ ahụ dị umeala nʼobi ga-eweta nsọpụrụ.
24Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha,a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
25Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya,ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.
26Ị chọrọ ikpe ziri ezi?Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.
27Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị;ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.