Ilu28ibo_bib
1Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.2Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.5Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.6Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwukarịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.7Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.8Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye,na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.9Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị,ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.10Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ,ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara,ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.11Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe,ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.12Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ,ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.13Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya.Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.14Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke,ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.15Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụotu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.16Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya;ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.17Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikperuo ala mmụọ.Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.18Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranyaamaghị na ụkpa nọ na-eche ya.23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amarakarịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,“Olee ihe ọjọọ dị na ya?”Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.26Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu!Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.27Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị.Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.28Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha,ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.