Ilu26ibo_bib

1Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụdịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.2Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharịotu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.3Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ;otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.4A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.5Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.6Iziga ozi site nʼaka onye nzuzudịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.7Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije,otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.8Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide.Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.9Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya okeotu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.10Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi,otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.11Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.12Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya?Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.
13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ,ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya,otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.15Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nrima oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.16Nʼuche ya, onye umengwụ na-eche na ọ maara ihekarịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.
17Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị yadị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.
18Dịka onye ara na-agba àkụna-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,19ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi yama sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”
20Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ,otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.21Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ,otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.22Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
23Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie,ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.24Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha,ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.25Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha,nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.26Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya,ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.27Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya.Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.28Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha.Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.