Ilu22ibo_bib
1Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ,ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.2Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyịonye kere ha niile.3Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya,ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị,ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.5Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu;ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.7Dịka ọgaranya si achị ogbenye,otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.8Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi,mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.9Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi,nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.10Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị,e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.11Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya,onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.12Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma,ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi!A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”14Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu,nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.15Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.16Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike,maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.