Ilu20ibo_bib
1Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ.Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.2Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm;ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.3Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka,ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.4Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya.Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.5Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi,ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.6Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ,ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?7Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke,ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.8Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe,ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.9Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha;Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?”10Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu,ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.11Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile,nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?12Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ,ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.13Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa.Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.14“Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị,ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.15Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba,ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.16Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe.Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.17Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ.Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.18Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime;ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.19Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị,nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.20Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna yaka Chineke na-afụnyụ.21Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ,agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.22A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.”Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.23Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị,ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.24Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ.Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?25Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnyama mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.26Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume,ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.27Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya,ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.28Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze,site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.29Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha,ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.30Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ,ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.