Ilu2ibo_bib

Ịba uru nke amamihe

1Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niilezobekwa iwu m niile nʼime obi gị,2tọọ ntị gị nʼala nye amamihe,wepụta obi gị inwe nghọta.3E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku,ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,4ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọchamaọbụ akụ nke zoro ezo,5mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyịchọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.6Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.7Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu,ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.8Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso,na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.
9Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezina ihe dị mma na ezi ụzọ niile.10Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị,ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.11Izuzu zuruoke ga-echebe gị,nghọta ga na-eche gị nche.
12Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie,sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,13ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chinekena-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,14ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ,nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.15Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ,jọọkwa njọ.
16Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna,na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.17Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ,nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.18Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọnke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.19Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi.Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.
20Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume,debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,21nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ,ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.22Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ,ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.