Ilu19ibo_bib
1Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obikarịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.2Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mmaotu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.3Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm,ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.4Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.5Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.6Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ,otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.7Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị,gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme?Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọezughị ime ka ha nọgide.8Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.9Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.10Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya;ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.11Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi;ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.12Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.13Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.14Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị.Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.19Onye oke iwe ga-anata nra so ya,nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.20Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị.Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.21Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.22Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.23Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ,na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.24Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri,ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.25Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche,baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.26Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.27Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m,ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.28Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo.Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.29Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ;a ga-etikwa ha ihe.