Ilu18ibo_bib
1Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.2Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.3Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.4Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.9Onye dị umengwụ nʼọrụ yabụ nwanne nke onye mbibi.10Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.11Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.12Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.13Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntịbụ enweghị uche na ihe ihere.14Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?15Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.16Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara,ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.17Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara,tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.18Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọdị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.19Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa.Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.20Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya.Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.21Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.22Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.23Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere;ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.24Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya,ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.