Ilu17ibo_bib
1Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya,karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.2Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta iherema ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.3Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedoma Onyenwe anyị na-anwale obi.4Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie,onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.5Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya.Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.6Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.7Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu,otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.8Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ,ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.9Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie,ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.10Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara urukarịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.11Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke.Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya.12Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ yakarịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.13Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma,ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.14Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya,nʼihi ya ekwela ka ọ malite.15Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe,Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.16Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu;ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.18Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji,si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.19Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya.Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.20Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ.Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.21Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọdịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike,ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.23Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzoka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.24Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme,ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.25Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute,bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.26Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma,nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.27Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe,onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.28A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị,gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.