Ilu16ibo_bib
1Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime,ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.2Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya,ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.3Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị,ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.4Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya,o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.5Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị.Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.6Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie;ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.7Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ,ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.8Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omumekarịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.9Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị,maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.10Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta,ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.11Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị,ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.12Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị,nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.13Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu,ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.14Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ.Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.15Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ,ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.16Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihekarịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.17Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ,ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.18Nganga na-eweta ịla nʼiyi,mpako na-ewetakwa ọdịda.19Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga,na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.20Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma,onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.21A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere.Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.22Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya,ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.23Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya,egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.24Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ,ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.25Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.26Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ;agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.27Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ,egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.28Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu;ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.29Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha,na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.30Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ,onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.31Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.32Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya.Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.33A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị,maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.