Ilu14ibo_bib
1Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya,ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.2Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị;ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị.3Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako,ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha.4Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha,ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ.5Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ,ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla.6Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya;ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.7Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị,nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya.8Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga,ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.9Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo;ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi.10Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya,ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya.11A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi,ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.12Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.13Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị,ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.14Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha,ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya.15Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya;ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.16Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ,ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.17Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu,ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị.18Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ,ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma.19Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ,ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume.20Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị,ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.21Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie,ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.22Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu?Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.23Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru;ma oke okwu na-eweta ụkpa.24Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha,ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru.25Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ,ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ.26Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba;nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.27Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ;nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.28Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị,e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla.29Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta,ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.30Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo;ekworo na-eme ka o ree ure.31Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya,ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.32Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke,ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara.33Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide,ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya.34Ezi omume na-ewuli mba elu,ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla.35Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe;ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.