Ilu13ibo_bib
1Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna yama onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.2Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ,ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,ma okwu ọnụ onye na-emebi iwuna-ewetara ya ihere na nkọcha.6Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.7Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa.Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.8Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya,ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.9Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ,ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.10Nganga na-eweta esemokwu,ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.11Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.12Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.13Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya,ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.14Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.15Ezi nghọta na-eweta ihuọma,ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.16Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ,ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.17Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu,ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.18Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere;ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.19Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ,ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.20Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe,nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie,ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ,ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.23Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri,ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.24Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.25Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya,ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.