Ilu1ibo_bib
1Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.2Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka,maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,3nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche,ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.4Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche,ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.5Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara,ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.6Ka ha ghọta ilu niile na okwu niilena-esi nʼọnụ ndị maara ihe.7Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.