Ọbadaya1ibo_bib
Ọhụ Ọbadaya
1Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ.Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm.Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,“Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.”2“Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche;ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu.3Nganga nke obi gị eduhiela gị,gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu,onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu.Gị onye na-ekwu nʼime obi ya,‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’4A sịkwarị na i felie elu dịka ugo,ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando,aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.5“Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị,e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị,lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị!Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru?Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?6Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya,lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo!7Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị,ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala;ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu,ma ị gaghị achọpụta ya.8“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,“ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi,bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?9Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri.Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile,ka a ga-egbuda nʼagha.10Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike.Ihere ga-ekpuchi gị;a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.11Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị,na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya,sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafeefee nza iji kerie Jerusalem.Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.12Ma ị garaghị eleda nwanne gị anyanʼụbọchị nsogbu ya,ị garaghị aṅụ ndị Judanʼụbọchị ahụ e bibiri ha.Ị garaghị anyara ha isinʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.13I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ijenʼụbọchị ha nọ na nsogbu,o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha,nʼụbọchị ha nọ na nsogbu,maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ hanʼụbọchị nsogbu ha.14I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọigbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ,maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha,nʼụbọchị nsogbu ha.15“Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nsonye mba niile.Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị;ihe i metara ga-adị gị nʼisi.16Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụotu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị.Ha ga-aṅụ, ṅụọ,ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.17Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ,ọ ga-adị nsọ,ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.18Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ,ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ:ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka.Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya.Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụsite nʼụlọ Ịsọ.”Onyenwe anyị ekwuola ya.19Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichinʼugwu ugwu Ịsọ,ndị si na Shefelaga-enwekọta ala ndị Filistia.Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria.Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.20Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala,ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat.Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad,ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb.21Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọnmaka ịchị ugwu Ịsọ niile.Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.