Ọnụọgụgụ24ibo_bib
1Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.2Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.3O buru amụma ndị a sị,“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.4Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chinekeonye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,ebe obibi gị niile, gị Izrel!6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,a ga-ebulikwa alaeze ha elu.8“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.Ha nwere ike dịka atụ.Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.11Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”12Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,13‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?14Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”