Ọnụọgụgụ24ibo_bib

1Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.2Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.3O buru amụma ndị a sị,“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta,okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.4Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chinekeonye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile.Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb,ebe obibi gị niile, gị Izrel!
6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ,dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri,dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ,dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta,mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu.“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag,a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
8“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha.Ha nwere ike dịka atụ.Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha.Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile,jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm,dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha?“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị,ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.11Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”12Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,13‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?14Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”

Amụma Belam nke anọ

15Ya mere Belam kwuru okwu ndị a:“Amụma Belam nwa Beoa,amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,16amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke,onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa.Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.
17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a,ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso.Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie.Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie.Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab,na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.18A ga-emeri Edọm,Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha.Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.19Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta.Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”

Amụma Belam nke ise

20Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị:“Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile,ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”

Amụma Belam nke isii

21Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya:“E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!22Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile,mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”

Amụma Belam nke asaa

23Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya:“Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?24Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa.Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha,ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”25Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.