Ọnụọgụgụ13ibo_bib
Nledo ala Kenan
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,2“Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.”3Ya mere, dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị, Mosis zipụrụ ha site nʼọzara Paran. Ha niile bụ ndị ndu nʼetiti ụmụ Izrel.4Nke a bụ aha ha:Site nʼebo Ruben, Shamua nwa Zakua,5Shafat nwa Hori, onye si nʼebo Simiọn.6Kaleb nwa Jefune, onye si nʼebo Juda.7Igal nwa Josef, onye si nʼebo Isaka.8Hoshea nwa Nun, onye si nʼebo Ifrem9Palti nwa Rafu, onye si nʼebo Benjamin.10Gadiel nwa Sodi, onye si nʼebo Zebụlọn.11Gadi nwa Susi, onye sitere nʼebo Manase (ya bụ ebo Josef).12Amiel nwa Gemali, onye si nʼebo Dan.13Setua nwa Maikel, onye si nʼebo Asha.14Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị.15Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad.16Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.)17Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu.18Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole.19Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.20Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.)21Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.22Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.)23Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl,ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.24A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ.25Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.