1Ugbu a doo ndị agha gị nʼusoro, gị obodo nke usuu ndị agha,nʼihi na e jirila mgbidi gbaa gị gburugburu ibuso gị agha.Ha ga-eji mkparatie onyendu Izrel na nti.2“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata,ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile,ma onye ahụ ga-achị Izrelga-esi na gị pụta,bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie,sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.”3Ya mere, a ga-arara ha nyetutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya.Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụga-alọghachikwuru ndị Izrel.4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya,site nʼike nke Onyenwe anyị,na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya.Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu,nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
Mgbapụta na Mbibi
5Ọ ga-abụkwa udo anyị.Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike,sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe,anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa,ọ bụladị ndịisi asatọ.6Onye ga-eji mma agha chịa ala Asịrịa,jirikwa mma agha a mịpụtara amịpụta chịa ala Nimrọd.Ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị Asịrịa ahụ,mgbe ha ga-eji ike bata nʼala anyị,ma zọrọkwa ije gafee oke ala anyị.7Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọbga-adị nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụ,dịka igirigi si nʼebe Onyenwe anyị nọ abịa,maọbụ dịka mmiri ozuzo ntakịrị na-ezokwasị ahịhịa,nke na-adịghị ele anya mmadụmaọbụ chere ụmụ mmadụ.8Ndị fọdụrụ afọdụ nke Jekọbga-adịkwa nʼetiti ọtụtụ ndị mmadụdị ka ọdụm nʼetiti anụ ọhịa niile dị iche iche,e, dịka nwa ọdụm nʼetiti igwe atụrụ,nke na-azọda na-adọkasị mgbe ọ na-agabiga,ma o nweghị onye ga-anapụta ya.9Aka gị ga-adị elu na mmeri nke ndị iro ya,a ghakwaghị ịla ndị iro gị niile nʼiyi.10“Nʼụbọchị ahụ kwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,“Aga m ala ịnyịnya unu nʼiyi site nʼetiti unu,kụjisiekwa ụgbọala unu niile.11Aga m ala obodo niile dị nʼala unu nʼiyi,dọdasịakwa ebe unu niile e wusiri ike.12Aga m ala mgbaasị unu nʼiyi,unu agaghị enwekwa ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase.13Aga m ala arụsị a pịrị apị unu niile nʼiyi,ya na nkume nsọ ahụ niile dị nʼetiti unu.Unu agakwaghị akpọ isiala nyeihe unu ji aka unu kpụọ.14Aga m ehopu ogidi arụsị niile nke dị nʼetiti unu,mgbe m ga-akụdasị obodo unu niile15Aga m esite nʼoke iwe m na ọnụma m bọọrọ onwe m ọbọnʼahụ mba niile ndị ahụ jụrụ irubere m isi.”