1Mgbe ahụ ekwuru m sị,“Geenụ ntị unu ndịisi ụlọ Jekọb,na unu ndị na-achị ezinaụlọ Izrel.Ọ bụ na unu ekwesighị ịmata ikpe ziri ezi2unu bụ ndị kpọrọ ezi ihe asị ma na-ahụ ajọ ọrụ nʼanya.Unu na-agba ndị m akpụkpọ na ndụna-agbapụkwa anụ ahụ kpuchiri ọkpụkpụ ha.3Unu na-erida anụ ahụ ndị nke m,na-agba ha akpụkpọ,na-etijisi ọkpụkpụ ha,na-egburi anụ ahụ ha,dịka anụ a na-esinye nʼite.”4Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị,ma ọ gaghị aza ha!Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọnʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:“Banyere ndị amụmabụ ndị na-eduhie ndị m,mgbe ha nwere ihe ha ga-eri,ha na-ekwusa ‘Udo’ma ọ bụrụ na mmadụ enyeghị ha nri,ha na-ebili buo agha megide onye dị otu a.6Ya mere nʼabalị ga-abịakwasị ha, napụ ha ike ịhụ ọhụ;ọchịchịrị ga-ekpuchi ha, ka ha ghara ịjụta ase ọbụla.Anwụ ga-ada nʼebe ndị amụma ahụ nọ,ụbọchị ga-agbakwa ọchịchịrị nye ha.7Ndị ọhụ ụzọ ka ihere ga-eme,ndị na-ajụ ase ka a ga-emebọ.Ha ga-ekpuchi ihu ha,nʼihi na ọsịsa ọbụla agaghị esite nʼebe Chineke nọ bịara ha.”8Ma mụ onwe m, ejupụtara m nʼike,ejupụtara m na Mmụọ nke Onyenwe anyị,jupụtakwa na mmụọ nke ikpe ziri ezi,na nke ịdị ike ikwupụta nye Jekọb njehie ya,na nye Izrel mmehie ya.9Geenụ ntị unu ndị na-achị ezinaụlọ Jekọb,na unu ndịisi ezinaụlọ Izrel.Ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị,ma na-ewere ihe niile na-ezighị ezi nʼọnọdụ ihe ziri ezi.10Ndị ji ọbara wuo Zayọn,werekwa ajọ omume wuo Jerusalem.11Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị,ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ,ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego.Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị,“Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị?O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”12Ọ bụ nʼihi gịka a ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi,Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ,ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.