1Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha,na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche.Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara,nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha.2Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike,na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike.Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha,ha na-ezunara ha ihe nketa ha.3Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị,“Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a,nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu.Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa,nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.4Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu,ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị,‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi,e kesaala ihe nnweta nke ndị m,ọ napụla m ha.O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ”5Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị,onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.
Ndị amụma ụgha
6Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.”“Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a,ihere agaghị eme anyị.”7Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb?“Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla?Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?”“Ọ bụ na okwu m adịghị emeonye ụzọ ya ziri ezi mma?8Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị mdịka ndị iro.Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafeuwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta,dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị msite nʼụlọ afọ ojuju ha.Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị mruo mgbe ebighị ebi.10Bilienụ, pụọnụ,nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike,nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya,o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.11Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị,‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ.
Nkwa nzọpụta
12“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb,aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe.Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ,dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya,ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.13Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha.Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee.Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha,Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”