Jona2ibo_bib

1Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere.2Ọ sịrị,“Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị,ọ zakwara m.Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị,ị nụkwara olu akwa m.3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,nʼetiti oke osimiri.Osimiri dịkwa m gburugburu,ebili mmiri gị na mmali mmiri gịgabigakwara m nʼisi.4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gịchụpụ m;ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọnʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’5Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,ogbu mmiri na-erikpu m.Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.6Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,Onyenwe anyị, bụ Chineke m.
7“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,e chetara m gị Onyenwe anyị,ma ekpere m bịakwutere gị,nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
8“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara,na-agbakụta ebere Chineke azụ.9Ma ọ bụ olu abụ ekeleka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ”10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.