Job9ibo_bib

Okwu Job

1Job zara sị:2“Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?3Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?4Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?5Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,na-akwatụ ha nʼiwe ya.6Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,mee ka ogidi ya maa jijiji.7Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.8Naanị ya gbasara mbara eluigwe,ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.9Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orionna Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.10Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.11Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.12Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’13Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.
14“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?15Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.16A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.17Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.18Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachikama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.19Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.20A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.
21“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghịejighị m onwe m kpọrọ ihe;nʼezie ana m eleda ndụ m anya.22Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’23Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.24Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya.Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?
25“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.26Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.27Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’28Nsogbu m niile ka na-atụ m egwunʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.29Ebe m bụrịị onye ikpe mara,nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?30A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ mwerekwa soda saa aka m abụọ,31ị ga-enuba m nʼolulu apịtịnke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.
32“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.33A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,34onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.35Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.