1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:2“Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a?Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.3Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?4Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya,o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.5Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike,rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,6ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi,ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gịweghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.7Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala,ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.8“Jụọ ọgbọ ndị gara agama chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.9Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara.Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.10Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe?Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?11Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị?Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?12Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.13Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.14Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.15Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.16Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.17Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.18Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’19Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.20“Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ,maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.21Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị.Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.22Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe,ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”