Job7ibo_bib

1“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba?Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?2Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada,maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,3otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya,nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ;anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
6“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa,ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.7O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume;anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.8Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ;unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.9Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa,otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.10E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ;ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
11“Ya mere agaghị m emechi ọnụ;aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ.Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.12A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri,nke mere i ji eche m nche?13Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi,maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,14nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwuwerekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,15ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ,karịa inwe ụdị ahụ m nke a.16Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi.Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
17“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe,i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,18i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile,ma na-anwale ya mgbe mgbe?19Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ,maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?20Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị,gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme?Gịnị mere i ji elekwasị m anya?Abụrụla m ibu arọ nye gị?21Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m,ma bupụ mmehie m?Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ.Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”