1Mgbe ahụ, Job zara sị:2“A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu mya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!3Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri,nke mere okwu m ji ada ike ike.4Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m;mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha;ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.5Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata,ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?6A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu,ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?7A jụrụ m ịmetụ ya aka,nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.8“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.9Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa mka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.10Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a,wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide,na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.11“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ?Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?12Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume?Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?13Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka,ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?14“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọna-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.15Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha,dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,16nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi,nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.17Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị,nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.18Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha.Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.19Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri,otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.20Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi,ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.21Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru,unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.22O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m,sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,23gbapụtanụ m nʼaka ndị iro,maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?24“Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ,gosi m ebe m si mejọọ.25Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi!Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?26Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m?Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?27Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna,ma refukwaa enyi unu.28“Lezie m anya nke ọma,ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?29Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi,tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.30Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta?Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?