Job5ibo_bib

1“Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị?Ole ndị dị nsọ ị ga-agbakwuru?2Oke iwe na-egbu onye nzuzu,ekworo na-egbu onye na-enweghị uche.3Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ,mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ.4Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị,a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha.5Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi;ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu;akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso.6Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta,ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite.7Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu,dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu.
8“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke;ya ka m ga-akọsara ihe niile.9Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta,ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.10Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo,ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.11Ọ na-ebuli ndị dị ala elu,na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha.12Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ,ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere.13Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile,mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ.14Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie,nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị;15Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ,ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike.16Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya,ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya.
17“Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị;ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile.18Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha;Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.19Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii,mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa.20Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ;chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha.21Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị.Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.22Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi,ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche.23Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ,gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo.24Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo;ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu.25Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ,matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala.26Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi,dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru.
27“Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu.Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị.”