Job41ibo_bib
1“Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatanmaọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya?2Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi yamaọbụ were ngu igwe mapuo agba ya?3Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere?Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?4Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?5Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ?Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?6Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa?Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?7Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ yamaọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?8Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka,ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.9Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya.Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu.10Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe.Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m?11Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ?Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.12“Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan,na ike ya, na ụdịdị ya mara mma.13Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ?Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?14Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya,nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?15Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoronke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,16nke ọbụla dị ibe ya nso,na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.17E jikọtara ha ọnụ nke ọma,ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.18Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere;anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ.19Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya,icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya.20Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta,dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.21Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku.Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.22Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya,obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.23Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma,ha siri ike na-apụghị inugharị ha.24Obi ya dị ike dịka nkume,dịka nkume e ji akwọ ihe.25Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ;ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.26O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya,o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya.27Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa;bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.28Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga,ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.29Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka,ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.30Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ,nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.31Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite;ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.32Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga;mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ.33O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya,o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ.34Ọ na-eleda ndị mpako niile anya.Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”