Job4ibo_bib

Okwu Elifaz

1Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:2“Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?3Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.4Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.5Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.6Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?
7“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?8Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụkana-aghọta ya dịka ihe ubi.9Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta.Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.10Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.11Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara,ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.
12“E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.13Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,14oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.15Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.16Ọ kwụsịrị;ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ.Onyinyo guzooro nʼanya m,anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:17‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?18Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,19ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,bụ ndị ntọala ha dị nʼaja,ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.20Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.21Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’