Job37ibo_bib
1“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji,na-amali elu site nʼọnọdụ ya.2Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.3Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.4Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe,mgbe olu ahụ dara dakwasị,ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.5Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.6Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’7Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya;ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.8Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe;ha na-anọgide nʼebe obibi ha.9Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa,oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.10Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri,ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.11Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri;na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.12Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburuimezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha meenʼelu ụwa niile.13Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ,na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.14“Job, gee ntị.Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.15Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojiina-eme ka amụma gbuo?16Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?17Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụmgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,18ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwenke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?19“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.20A ga-agwa ya na m nwere okwu?Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?21Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anyaka ọ na-achake na mbara igwe,mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.22Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.23Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu,nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.24Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya,ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”