Job35ibo_bib

1Mgbe ahụ, Elihu sịrị:2“Ị na-eche na nke a ziri ezi?Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’3Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m,gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’
4“Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị,zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.5Lelie anya na eluigwe ma hụkwa.Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.6Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya?Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?7Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya,maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?8Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị,ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.
9“Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu,ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.10Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ,onye na-enye abụ nʼime abalị,11onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa,onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’12Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa,nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.13Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha;Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.14Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntịmgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya,na i burula ikpe gị bịa nʼihu yana ị ga-anọkwa na-eche ya!15Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ,nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.16Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe;ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”