Job33ibo_bib
1“Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m;ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.2Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu;okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.3Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.4Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.5Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.6Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.7Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.8“Ma ị kwuola ya na ntị m,anụrụ m okwu ndị ahụ niile,9‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere;adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.10Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ;ọ na-ahụta m dịka onye iro ya.11Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ;ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’12“Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma,nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.13Gịnị mere i ji na-ekpesara yana ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?14Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.15Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra,mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.16O nwere ike kwunye ha okwu na ntịma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;17ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,18ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.19“Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.20Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.21Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.22Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.23Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ,onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,24ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili;achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.25Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’26Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.27Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume,ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;28ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’29“Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.30Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.31“Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m;dere jii ka m kwuo okwu.32Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m;kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.33Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị;dere jii, ka m zi gị amamihe.”