Job30ibo_bib

1“Ma ugbu a, ha na-akwa m emobụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ,bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta.2Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m,ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike?3Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụna-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.4Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.5A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.6A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.7Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ,na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.8Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha,e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.
9“Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo;abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị.10Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso;ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu.11Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m,o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m.12Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.Ha na-esiri ụkwụ m ọnya,ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.13Ha na-etiwasị ụzọ m,ha kwadoro mmekpa ahụ m.‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.14Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.15Oke egwu abịakwasịla m;ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru,nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.
16“Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga;ụbọchị ahụhụ ejidela m.17Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m,ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.18Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe;ọ na-ekechi m dịka olu uwe m.19Ọ na-atụba m nʼime apịtị,mee ka m ghọọ ntụ na aja.
20“Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m;anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m.21Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere;i ji aka gị dị ike megide m.22Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe,ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri.23Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ;ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.
24“Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala;mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.25Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu;ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?26Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara;mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.27Obi m anaghị ezu ike nʼime m;ụbọchị ahụhụ na-ezute m.28Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ.Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka.29Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa;onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.30Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere;anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ.31Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ;ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.