Job29ibo_bib

Ngọpụ ikpeazụ Job

1Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:2“Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga,dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,3mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisiìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.4Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,5mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere mna mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,6mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.
7“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodowere ọnọdụ m nʼama.8Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha,ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;9ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwuma were aka ha kpuchie ọnụ ha;10olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ,ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.11Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.12Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.13Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.15Abụ m anya nye onye ìsì,bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.17Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.
18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.19Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.20Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’
21“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị,ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.22Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ.Okwu m na-ada juu na ntị ha.23Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo,na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.24Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya;ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.25Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha;ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya;na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.