1Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:2“Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.3Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,4egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.5Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.6Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.7“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.8Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?9Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa yamgbe nsogbu dakwasịrị ya?10Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?11“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.12Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?13“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.14Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.15Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.16Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,17ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.18Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.19Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.20Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.21Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.22Ọ na-atụfu ya na-enweghị eberemgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.23Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”