Job25ibo_bib

Okwu Bildad

1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:2“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.3Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?4Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?5Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,6ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,mmadụ, nke bụ naanị idide.”