Job24ibo_bib
1“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe?Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a?2Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi.3Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.4Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.5Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri,ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.6Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.7Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi.8Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.9Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe.10Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.11Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya,ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.12Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka.Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,ndị na-amaghị ụzọ yamaọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa;nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ọ na-ekpuchikwa ihu ya.16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ,nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.19Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee,otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike.20Akpanwa na-echefu ha,ikpuru na-eji ha mere ihe oriri;anaghị echetakwa ndị ajọọ omumekama a na-etiji ha dịka osisi.21Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa,ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.22Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ,ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.23Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha,ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.24A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị,a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ,a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.25“Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụghasi otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”