Job23ibo_bib

Okwu Job

1Mgbe ahụ, Job zara sị:2“Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu;aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.3A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya;a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!4Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu yawere ịrụ ụka mejuo ọnụ m.5Aga m achọpụta ihe o ga-aza mma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.6Ọ ga-eji ike dị egwu megide m?Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.7Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya.Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.
8“Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ;ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.9Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya,mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.10Ma ọ maara ụzọ m na-aga,mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,11ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya;ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.12Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m;a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.
13“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya?Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.14Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m,ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.15Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya;mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.16Chineke emeela ka obi m daa mba;Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.17Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m,bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.