1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:2“Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachinʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.3Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.4“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie,ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.5Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.6Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;7ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’8Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.9Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.10Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.11Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịaga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.12“Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;13ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya,ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,14ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.15Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.16Ọ ga-amịcha elo agwọ,eze agwọ ajụala ga-egbu ya.17Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.18Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.19Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.20“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.21Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,ọganihu ya agaghị adịgide.22Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.23Mgbe o rijuru afọka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.24Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.25Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma.Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.26Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa yaọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.27Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma yaụwa niile ga-ebili megide ya.28Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.29Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”