Job17ibo_bib

1Mmụọ m tiwara etiwa,ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ,ili na-echere ịnabata m.2Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.
3“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?4I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,anya ụmụ ya ga-ada mba.
6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.
10“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.11Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi.Ma ọchịchọ nke obi m12na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie;nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.13Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili,ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,14a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’15ebeekwa ka olileanya m dị?Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?16Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ?Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”