1Mgbe ahụ, Job zara sị:2“Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a;ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.3Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị?Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?4Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu,ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m;enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu,ma fufekwaa isi m megide unu.5Ma ọnụ m ga-agba unu ume;nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.6“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m,ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?7Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m,i tidakwala ezinaụlọ m.8I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.9Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m;onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.10Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,jikọtakwa onwe ha megide m.11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.12Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.O meela m ihe ịgba ụta ya;13ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịikomee ka oluilu m wụsịa nʼala.14Mgbe niile, ọ na-emegide m;ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.15“Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m,liekwa ikuanya m nʼime ntụ.16Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa,onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;17ma aka m emeghị ihe ike ọbụla,ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.18“Ala, biko, ezokwala ọbara m;mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!19Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe,onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.20Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m,dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.21Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chinekedịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.22“Naanị afọ ole na ole ga-agabigatupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.