Job14ibo_bib

1“Mmadụ nke nwanyị mụrụnwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.2Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya,dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.3Ị na-elegide onye dị otu a anya?Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?4Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha?Ọ dịghị onye ọ bụ.5Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ;ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile,kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.6Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe yaruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.
7“Ma olileanya dịịrị osisi;nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa,alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.8A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala,maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,9mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya,ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.10Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya;ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.11Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata,maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,12otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ;tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya,agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.
13“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ,na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara.A sị na ị ga-akanyere m ogema mesịa cheta m.14Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ?Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m,aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.15Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị,agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.16Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ,ma ị gaghị agụkọ mmehie m.17A ga-ekechi njehie m nʼakpa,ị ga-ekpuchi mmehie m.
18“Ma dịka ugwu si erichasi daa,na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,19dịka mmiri si akwọchasị nkume,na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala,otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.20Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga;ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.21Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a;ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.22Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-amama na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”