Job13ibo_bib
1“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile,ntị m anụla ma ghọtakwa ha.2Mụ onwe m makwa ihe unu maara;abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ.3Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu,ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.4Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.5Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.6Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m;geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.7Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide?Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya?8Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe?Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?9Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu?Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?10Ọ ghaghị ịbara unu mbama ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.11Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji?Egwu ya ọ dịghị atụ unu?12Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ;okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.13“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu;ihe ọ pụtara ya pụta.14Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu,werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m?15A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m.Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha.16Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụtamaka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.17Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m.Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.18Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro,amatala m na ikpe agaghị ama m.19Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo ?Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.20“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke,mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.21Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ.Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji.22Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị.Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m.23Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere?Gosi m ajọ omume m na mmehie m.24Gịnị mere i ji gbakụta m azụ?Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị?25Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ?Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?26Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m,na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.27Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ;na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niilesite nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.28“Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere,na dịka akwa nke nla riri.