1Mgbe ahụ, Job zara:2“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe,unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.3Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ.Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za,onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anyadịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.6Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo,bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.7“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị,maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.8Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị,maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.9Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghịna ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?10Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị,ya na ndụ ụmụ mmadụ11Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu,otu ire si anwale ihe oriri?12Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye?Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?13“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike,ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.14Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ;mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.15Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa.Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.16Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị;ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.17Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha,ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.18Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere,ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.19Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha,kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.20Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi,wepụkwa nghọta nke ndị okenye.21Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị,napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.22Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrịmeekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.23Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi;Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.24Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha,zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.25Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè.Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.