Job10ibo_bib
1“Ike ịdị ndụ agwụla m.Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi,kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.2Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe,kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.3Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m,si otu a leda ọrụ aka gị anya,mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?4Ị nwere anya nke anụ ahụ?Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?5Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ,ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?6Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma mma nyochaa mmehie m?7Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m,na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.8“Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m.Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?9Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ.Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?10Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehimee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?11Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ,werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?12I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.13“Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.14Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.15Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elunʼihi na ejupụtara m nʼihere,bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụma werekwa ike gị dị egwu megide m.17I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ;ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.18“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.19A sịkwarị na amụpụtaghị mmaọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!20Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole?Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,21tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụebe m na-agaghị esi pụtakwa.22Nʼala nke oke ọchịchịrị,ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị,ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”