Jeremaya49ibo_bib
Ozi e ziri banyere Amọn
1Nke a dịrị ndị Amọn:Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom?Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere?Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad?Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile?2Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,“mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha,nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn.A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe.A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu.Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwandị ahụ niile chụpụrụ ya.”Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.3“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai!Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba!Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ;gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu,nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha,buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.4Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwunke na-amị mkpụrụ hiri nne,gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi,onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya,gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’5Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburumee ka oke egwu bịakwasị gị,”otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya,“A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu.Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.6“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ozi e ziri banyere Edọm
7Nke dịrị Edọm:Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,“Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman?Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta?Amamihe ha o reela ure?8Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan.Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi,nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ,nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.9Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị,ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ?10Ma aga m agba Ịsọ ọtọ.Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niileka ọ ghara izobe onwe ya.Ụmụ ya na ndị ikwu ya,tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi.Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị,11‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ.Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ”12Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.”13“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”14Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị.E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,“Chịkọtaanụ onwe, megide ya.Bilikwanụ maka ibu agha!”15Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche,ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.16Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu,na nganga nke obi gị eduhiela gị,gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu,gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya.A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya,aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala,otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.17“Edọm ga-aghọ ihe iju anya.Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya,ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.18Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,ya na obodo niile gbara ya gburugburu.Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru.19“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya,dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdanna-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ.Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya?Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”20Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm,nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman.A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ,ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.21Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha;iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie.22Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa.Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile.Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọmga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
Ozi e ziri banyere Damaskọs
23Nke dịrị Damaskọs:“Ụjọ ejula Hamat na Apad obi,nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ.Ha adaala mba,nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya.24Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ.Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ,ma ọma jijiji ejidela ya.Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike,dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.25Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya,bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?26Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile,a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.27“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.”Ozi e ziri banyere Keda na Hazọ
28Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha:Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“Bilienụ gaa buso Keda agha.Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.29A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha.A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile,ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile.Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha,‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’30“Gbalaganụ ọsịịsọ.Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,”otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu,o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu.31“Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha,bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,”otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,“mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya,mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha.32Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha,ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha.Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha.Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,”otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.33“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa.Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ,nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”