Jeremaya4ibo_bib
1“Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka Onyenwe anyị kwubiri,mụ ka ị ga-alọghachikwute,”“Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m,hapụ isi ebe m nọ kpafuo,2ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omumeṅụọ iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na yanyakwaa isi nʼime ya.”3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị,“Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị;unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu.4Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị,biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu,unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalemma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ,nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere,ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya.